Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Na 2 Timoti 4:2, Bible na-ekwu na mgbe ụfọdụ, ndị okenye aghaghị ‘ịdọ aka ná ntị, ịba mba, ịgba ume.’ Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “gbaa ume” bụ pa·ra·ka·leʹo. Okwu Grik yiri ya, bụ́ pa·raʹkle·tos, pụrụ izo aka n’onye na-ekpechitere mmadụ ọnụ ya n’okwu ikpe. N’ihi ya, ọbụna mgbe ndị okenye na-enye mmadụ ịdọ aka ná ntị siri ike, ha ga-abụ ndị na-enyere ndị enyemaka ime mmụọ dị mkpa aka.