Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b E nwekwara ihe ndị ọzọ e si otú a kwuo n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, “Chineke bụ ìhè” na “Chineke . . . bụkwa ọkụ na-erepịa erepịa.” (1 Jọn 1:5; Ndị Hibru 12:29) Ma a ghaghị ịghọta okwu ndị a dị ka okwu ihe atụ nke na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ, n’ihi na ha ji Jehova na-atụnyere ihe ndị a na-ahụ anya. Jehova dị ka ìhè, n’ihi na ọ dị nsọ ma zie ezi. Ọ dịghị “ọchịchịrị,” ma ọ bụ adịghị ọcha dị n’ime ya. A pụkwara iji ya tụnyere ọkụ n’ihi otú o si eji ike o nwere ibibi ihe eme ihe.