c Taịtọs bụ onye Grik ghọrọ Onye Kraịst. O mechara bụrụ onye ozi Pọl tụkwasịrị obi nke na-eso ya eme njem. O yikwara ka ò so ná ndị ahụ e zigara Jeruselem. (Gal. 2:1; Taị. 1:4) Ọ bụ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù, bụrụkwa ezigbo nwanna e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.—Gal. 2:3.