Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Mgbe afọ ole na ole gachara, Pọl onyeozi degaara Ndị Hibru akwụkwọ ozi o ji gosi ha na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ka nke ochie mma. N’akwụkwọ ozi ahụ, o mere ka o doo anya na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kagburu ọgbụgba ndụ ochie. Ọ bụghị naanị na Pọl gwara ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst ihe doro anya ha ga-aza ndị Juu ibe ha na-emegide ha, kama ọ ga-abụrịrị na ihe o kwuru mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst bú Iwu Mosis n’isi nabata ihe ọhụrụ ahụ a kụziiri ha.—Hib. 8:7-13.