Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Tetọlọs kelere Feliks maka na o “meela ka udo dịrị n’obodo” ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na e wepụ n’oge ndị Juu nupụụrụ Rom isi, udo adịchaghị na Judia n’oge Feliks bụ gọvanọ otú ọ dị n’oge gọvanọ ndị ọzọ chịrị Judia. Ihe ọzọ na-abụghị eziokwu o kwuru bụ na ndị Juu “na-ekele” Feliks maka na otú dị mma o si achị emeela ka ha na-enwe ọganihu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị Juu kpọrọ Feliks asị n’ihi na o mekpọrọ ha ọnụ, jirikwa obi ọjọọ taa ha ahụhụ mgbe ha nupụrụ isi.—Ọrụ 24:2, 3.