Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na mmekọahụ ịnọkata gụwa mmadụ abụghị otu ihe. Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa nwere ike iteta n’ụra, mmekọahụ agụwa ya ma ọ bụ ya achọpụta na ọbara ọcha gbapụrụ ya n’ahụ́ mgbe ọ na-arahụ ụra. Otú ahụkwa ka agụụ mmekọahụ nwere ike ịnọkata gụwa nwa agbọghọ mgbe nsọ ya chọrọ ịmalite ma ọ bụ mgbe nsọ ya kwụsịchara. Ma, onye na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eji aka ya eme ka mmekọahụ gụsiwe ya ike.