Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a E nwere ụdị ego ndị Juu si ebe ọzọ bịa Jeruselem na-eji akwụ ụtụ isi ha kwa afọ. Ndị na-agbanwe ego na-ana ha ego mgbe ha na-agbanwere ha ego kịrịkịrị ha ji bịa. Ihe ọzọ bụkwa na, ndị Juu a si esi bịa na-azụ anụmanụ ha na-eji achụrụ Chineke àjà. Jizọs kpọrọ ma ndị na-agbanwere ha ego ma ndị na-eresị ha anụmanụ ndị ahụ “ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Ọ ga-abụ na ihe mere o ji kpọọ ha aha a bụ n’ihi na ha na-ana ha ego karịrị akarị.