Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Gunyere ihe ndị ọzọ, isiokwu ahụ siri: “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ a gbara àmà eziokwu ahụ n’ụzọ sara mbara dị ka e meworo ya n’ime afọ ole na ole gara aga. . . . Ihe ahụ fọdụrụ na-ewetara ha ozi obi ụtọ ahụ, ha na-agwakwa ha, si: ‘Onye ọ bụla ọ masịrị, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’ A na-agwa ha na ha pụrụ iwere ọnọdụ ha ugbu a n’akụkụ nke Onyenwe anyị, megidekwa Ekwensu, ma nata ngọzi. Ọ́ bụghị òtù ụmụ mmadụ dị otú ahụ pụrụ ịchọ ịdị umeala n’obi na ezi omume ugbu a, bụrụkwa ndị e zobere n’ụbọchị ngosipụta iwe ya, e wee buru ha gabiga oké agha Amagedọn ahụ, ha wee dịrị ndụ ebighị ebi ma ghara ịnwụ anwụ? (Zef. 2:3) . . . Òtù ihe ahụ fọdụru kwesịrị ntụkwasị obi na-esonye n’ọkpụkpọ òkù amara ahụ ma na-asị, ‘Bịa.’ A ga-akpọsa ozi nke a gwa ndị ahụ nwere ọchịchọ ezi omume na eziokwu. A ghaghị ime nke a ugbu a.”