Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’ezie, ha chụpụrụ ndị ogbenye site n’okwu ịkpọasị bụ́ “ʽam-ha·ʼaʹrets,” ma ọ bụ “ndị nke ala.” Dị ka otu onye ọkà mmụta si kwuo, ndị Farisii kụziri na mmadụ ekwesịghị inye ha ihe ndị bara uru ná ntụkwasị obi, ma ọ bụ ịtụkwasị akaebe ha obi, ma ọ bụ kpọbata ha dị ka ndị ọbịa, ma ọ bụ bụrụ ndị ọbịa ha, ma ọ bụ ọbụna zụnara ha ihe. Ndị ndú okpukpe ahụ kwuru na nwa nwanyị mmadụ ịlụ otu onye n’ime ndị a ga-adị ka ike ya agbụ ma tụhapụrụ ya anụ ọhịa.