Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’ikwu banyere ahụmahụ ndị e nwere n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke Nazi, Dr. Viktor E. Frankl ghọtara, na: “Ọchịchọ mmadụ na-achọ nzube bụ nkwali bụ́ isi ná ndụ ya, ọ bụghịkwa ‘nchepụta dị n’ọnọdụ nke abụọ’ ndị amamihe ebumpụta ụwa na-akpali,” dị ka ụmụ anụmanụ nwere. Ọ gbakwụnyere na ọtụtụ iri afọ mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị, nnyocha e mere na France “gosiri na 89% nke mmadụ ndị a jụtara echiche ha kwetara na ‘ihe’ mmadụ ga-adịrị ndụ dị ya mkpa.”