Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Dị ka Jisọs kpughere n’ilu ọka na ata nakwa n’ihe atụ ya nke ụzọ ahụ dị obosara na nke dị warara (Matiu 7:13, 14), mmadụ ole na ole ga-anọgide na-agbaso ezi Iso Ụzọ Kraịst ruo ọgbọ nile. Otú ọ dị, ndị ka ọtụtụ bụ́ ndị yiri ata, bụ́ ndị ga-akwalite onwe ha na ozizi ha dị ka ihu ziri ezi nke Iso Ụzọ Kraịst, ga-ekpuchi ha. Ọ bụ ihu a ka isiokwu anyị na-ezo aka na ya.