Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a A gaghị ewepụ mkpanaka ndị ahụ n’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka a rụnyere n’akụkụ Igbe ahụ ọbụna mgbe Igbe ahụ dọsa n’ụlọikwuu ahụ. N’ihi ya, a pụghị iji mkpanaka ndị ahụ mee ihe ọ bụla ọzọ. Ọzọkwa, a gajeghị imetụ Igbe ahụ aka; a sị na a na-ewepụ mkpanaka ndị ahụ n’ebe ndị ahụ e tinyere ha, ọ ga-eme ka a na-emetụ Igbe ahụ dị nsọ aka iji tinyeghachi mkpanaka ndị ahụ mgbe ọ bụla a chọrọ iburu ya. Ihe e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 4:6 banyere ‘itinye mkpanaka ndị ahụ’ pụrụ izo aka n’idozigharị ma ọ bụ ịhịgharị ha mgbe a na-akwadebe iburu igbe ahụ dị arọ gaa n’ebe ọzọ a ga-ama ụlọikwuu.