Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’ikwu banyere okwu Pọl kwuru na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obiọma,” ọkà mmụta Bible bụ́ Gordon D. Fee na-ede, sị: “Na nkà mmụta okpukpe nke Pọl kụziri, ha [ogologo ntachi obi na obiọma] na-anọchi anya akụkụ abụọ nke otú Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe (cf. Rom 2:4). N’otu akụkụ, Chineke gosipụtara ntachi obi o ji ịhụnanya na-enwe site n’ijichi ọnụma ya n’ebe ụmụ mmadụ na-enupụ isi nọ; n’aka nke ọzọ, a na-ahụ obiọma ya n’ọtụtụ puku ugboro o gosipụtara ebere ya. N’ụzọ dị otú a, nkọwa Pọl nke ịhụnanya ji nkọwa a gbara mkpị nke Chineke malite, bụ́ onye sitere n’aka Kraịst gosi onwe ya ịbụ onye nwere ntachi obi na obiọma n’ebe ndị kwesịrị inweta ikpe ọmụma Chineke nọ.”