Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ahọrọ nsụgharị bụ́ “Yahweh” kama ịhọrọ “Jehova.” Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụgharị Bible nke oge a ewepụchaala aha Chineke n’ụdị ya ọ bụla ná nsụgharị ha, na-eji utu aha ndị ahụ a maara n’ebe nile bụ́ “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke” dochie ya. Maka ntụle zuru ezu banyere aha Chineke, biko lee broshuọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.