Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ọ bụ ezie na e nwere echiche dịgasị iche iche, ụfọdụ na-akpọ ụlọ nsọ Dagan ụlọ nsọ El. Roland de Vaux, bụ́ ọkà mmụta bụ́ onye France, bụrụkwa Prọfesọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Bible nke Jeruselem, na-enye echiche na Dagan—Degọn nke Ndị Ikpe 16:23 na 1 Samuel 5:1-5—bụ ezigbo aha El. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu na ikekwe “e nwere ihe jikọrọ Dagan na [El] n’ụzọ ụfọdụ ma ọ bụkwanụ ha bụ otu ihe.” N’ihe odide ndị ahụ a chọtara na Ras Shamra, a kpọrọ Bel ọkpara Dagan, ma ihe okwu ahụ bụ́ “ọkpara” pụtara n’ebe ahụ edoghị anya.