Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b E nwere ọtụtụ ihe ndị a tụrụ atụ n’ahụ́ okwute ndị dị n’etiti ugwu na-agbọpụ ọkụ nke Rano Raraku. Ebe a bụ ebe a na-amalite asọmpi nke ndị na-achọ ịchị àgwàetiti ahụ. Nke a gụnyere ịkpọda ugwu ahụ, igwuru mmiri gaa n’otu n’ime àgwàetiti ndị ntakịrị dị ebe ahụ, iweta àkwá otu nnụnụ e nwere ebe ahụ, igwuru mmiri lọghachi n’àgwàetiti ahụ bụ́ isi, na ijiri àkwá ahụ gbagoo ugwu ahụ n’akụwaghị ya.