Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Denis Baly na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ The Geography of the Bible, sị: “Ọ ghaghị ịbụ na e nwewo mgbanwe dị ukwuu n’ụdị ihe ọkụkụ na-eto n’ebe ahụ kemgbe oge Bible.” Gịnị kpatara ya? “Osisi dị mmadụ mkpa maka nkụ na iwu ụlọ n’ihi ya kwa . . . mmadụ malitere igbutusị osisi ma si otú ahụ mee ka ihu igwe na-akpa ala ahụ aka ọjọọ. Ihe si ná ntinye aka dị otú a na mbara ala ahụ pụta bụ na ihu igwe . . . ji nwayọọ nwayọọ ghọọ ihe kasị ebibi ya.”