Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ka ọ na-akọwa omume a a na-eme n’oge ochie, akwụkwọ bụ́ The Holy Bible, With an Explanatory and Critical Commentary, nke F. C. Cook dere, na-akọwa, sị: “A na-eme nke a site n’ịtụba ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ nkume ọ bụla dị oké ọnụ ahịa n’ime mmiri, mgbe ahụzi na-ele otú ha ga-adị n’ime mmiri ahụ; ma ọ bụkwanụ a pụrụ ime ya nanị site n’ile anya n’ime mmiri ahụ dị ka e si ele anya n’enyo.” Onye na-akọwa Bible bụ́ Christopher Wordsworth kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, a na agbanye mmiri n’iko, a na-enwetakwa azịza ya site n’ihe ndị dị inyoghi inyoghi bụ́ ndị na-apụta mgbe anwụ chakwasịrị mmiri ahụ a gbanyere n’iko.”