Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe Jizọs kwuru na-eme ka anyị ghara inwe echiche na-ezighị ezi ụfọdụ nsụgharị Baịbụl nyere bụ́ ndị na-asụgharịtaghị okwu ahụ bụ́ “ọnụnọ.” Ụfọdụ nsụgharị sụgharịrị ya “ọbịbịa,” ma ọ bụ “nlọghachi,” bụ́ nke na-egosi na ihe niile a agaghị ewe oge. Ma, cheta na Jizọs ejighị ọnụnọ ya tụnyere Iju Mmiri ụbọchị Noa, bụ́ nke na-eweghị oge ọ bụla, kama o ji ya tụnyere “ụbọchị Noa,” ya bụ, oge pụrụ iche. Ọnụnọ Kraịst ga-adị ka oge Noa n’ihi na ọ bụ mgbe ndị mmadụ ga-eji obi ha niile na-achụ ihe nke ụwa nke ga-eme ka ha leghara ịdọ aka ná ntị a na-adọ ha anya.