Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c E kwuola na ọkpụkpọ a na-akpọtụghị Josef aha n’ozi Jizọs jere na-egosi na ọ nwụọla mgbe ahụ n’ihi na e kwuru banyere ndị ezinụlọ Jizọs ndị ọzọ, ma nne ya, ma ụmụnne ya ndị nwoke, ma ụmụnne ya ndị nwaanyị. Dị ka ihe atụ, n’oriri agbamakwụkwọ e nwere na Kena, Meri nyere aka ma mee ihe ụfọdụ n’onwe ya, ma, a kpọtụdịghị Josef aha. (Jọn 2:1-11) N’oge ọzọ, mgbe ndị obodo Kraịst nọ na-ekwu banyere Jizọs, ha kpọrọ ya “nwa Meri,” kama ịkpọ ya nwa Josef.—Mak 6:3.