Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụ ọbara anụmanụ mere iji anụmanụ ekpuchi mmehie ji baa uru, n’ihi na Chineke weere ọbara ka ihe dị nsọ. (Levitikọs 17:11) Ọ̀ pụtaziri na ntụ ọka ahụ e gwere egwe onye ogbenye nyere abaghị uru ọ bụla? Mbanụ. Ihe Jehova ji kpọrọ ihe bụ obi umeala onye ahụ na otú o si jiri obi ya chụọ àjà ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ọbara àjà anụmanụ a na-achụrụ Chineke otu ugbo n’afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kpuchiri mmehie mba ahụ niile, ma nke ogbenye ahụ.—Levitikọs 16:29, 30.