Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Ka ọ na-erule n’oge Jizọs Kraịst na ndịozi ya, e nweela akwụkwọ niile dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik. E mechara kpọwa nsụgharị a Septuagint, ndị Juu na-asụ Grik gụkwara ya mgbe niile. Ọ bụ na Septuagint ka e si nweta ihe ka ọtụtụ n’ọtụtụ narị ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.