Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mmadụ igburu onye ọbịa ya nwa atụrụ na-egosi na ọ bụ onye na-ele ọbịa. Ma, izu nwa atụrụ bụ ihe ọjọọ, onye ọ bụla mere ya ga-eji nwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ ya. (Ọpụpụ 22:1) N’anya Devid, nwa atụrụ ahụ ọgaranya ahụ weere gosiri na obi fere ya azụ. O si otú ahụ napụ ogbenye ahụ atụrụ ezinụlọ ya nwere ike isi na ya na-enweta mmiri ara atụrụ na ajị anụ na nke ga-amụtadịrị ha ìgwè atụrụ.