Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ebe nsọ ahụ bụ ihe owuwu nwere akụkụ anọ. Ihe bụ́ isi e ji rụọ ya bụ osisi, jirikwa nnukwu ákwà ụlọikwuu kpuchie ya. Ma, e ji ihe ndị kasị mma e nwere n’oge ahụ rụọ ya—akpụkpọ anụ sil, ákwà ndị a kpara ihe ndị mara mma na ha, na osisi ndị dị oké ọnụ ahịa e ji ọlaọcha na ọlaedo machie. Ebe nsọ ahụ dị n’ogige nwere akụkụ anọ, o nwekwara otu nnukwu ebe ịchụàjà. O doro anya na ka oge na-aga, a rụnyere ọnụ ụlọ ndị ọzọ n’akụkụ ụlọikwuu ahụ maka ndị nchụàjà. O yiri ka Samuel ọ̀ na-ehi n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị dị otú ahụ.