Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Akụkọ ahụ kwuru ụzọ abụọ ha si lelịa àjà a na-achụrụ Chineke. Otu bụ na Iwu ahụ kwuru kpọmkwem ebe ndị a ga-enye ndị nchụàjà n’anụ e ji chụọ àjà ka ha rie. (Diuterọnọmi 18:3) Ma, ajọ ndị nchụàjà ahụ na-eme ihe dị iche n’ụlọikwuu ahụ. Ha na-edunye ndị na-ejere ha ozi ka ha dụnye nnukwu ndụdụ n’ite mgbe a ka na-esi anụ esi, na-ewere ihe ọ bụla dị mma ndụdụ ahụ dụtara! Nke ọzọ bụ na mgbe ndị mmadụ wetara àjà ka a chụọrọ ha n’ebe ịchụàjà, ajọ ndị nchụàjà ahụ na-edunye onye na-ejere ha ozi ịmaja onye na-achụ àjà ahụ, na-esi ọnwụ ka e nye ya anụ ndụ ọbụna tupu a chụọrọ Jehova abụba ya n’àjà.—Levitikọs 3:3-5; 1 Samuel 2:13-17.