Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụ ezie na okwu bụ́ “nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ” adịghị na Baịbụl, okwu bụ́ “nwaanyị di ya nwụrụ” na “nwa na-enweghị nna” pụtara ugboro ugboro. Nke a na-egosi na e nwere ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ n’oge Baịbụl.—Aịzaya 1:17.