Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Levitikọs 19:18 sịrị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi; hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” Ndị ndú okpukpe ndị Juu na-ekwu na “ụmụ ndị gị” na “mmadụ ibe gị” bụ naanị ndị Juu. Iwu Mozis gwara ụmụ Izrel ka ha na ndị mba ọzọ ghara ịna-emekọrịta ihe. Ma, ọ kwadoghị ihe ahụ ndị ndú okpukpe na-ekwu na narị afọ mbụ, ya bụ na ndị niile na-abụghị ndị Juu bụ ndị iro e kwesịrị ịkpọ asị.