Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe Jizọs gwara Pita ihe ahụ dị na Matiu 16:18, ihe ha nọ na-akpa abụghị ọrụ Pita ga-arụ kama ọ bụ onye Kraịst bụ na ọrụ Kraịst ga-arụ. (Matiu 16:13-17) Pita n’onwe ya mechara kwuo na ọ bụ Jizọs bụ nkume ahụ e wukwasịrị ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Pita 2:4-8) Pọl onyeozi gosikwara na ọ bụ Jizọs bụ “nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala” ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ bụghị Pita.—Ndị Efesọs 2:20.