Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
e E nwere ụrọ ndị kọrọ banyere ahịa ndị a zụrụ n’afọ niile ndị eze ahụ nọ na-achị Babịlọn. Ọ bụrụ na a gbakọọ afọ niile ha chịrị, ma malite mgbe eze nke ikpeazụ, bụ́ Nabonidus, chịrị, gụrụ afọ ndị ahụ ruo mgbe eze Babịlọn nke bibiri Jeruselem chịrị, ọ ga-apụta na e bibiri Jeruselem n’afọ 587 T.O.A. Ma, naanị mgbe ịgbakọ ya otú a ga-adaba bụ ma ọ bụrụ na eze nke ọ bụla bidoro ịchị ozugbo eze bu ya ụzọ chịchara n’enweghị ọnwa ma ọ bụ afọ a na-enweghị eze.