Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Okwu ahụ bụ́ “apọkrịfa” si n’okwu Grik nke pụtara “izochi ihe.” Na mbụ, okwu ahụ pụtara ihe e dere ede nke a na-achọghị ka ndị ọzọ gụọ ma e wezụga ndị kweere n’ihe ahụ. Ka oge na-aga, okwu ahụ pụtaziri akwụkwọ niile na-esoghị na Baịbụl, ya bụ, akwụkwọ ndị a na-edeghị n’ike mmụọ nsọ.