Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ, e kwuru na Jehova bụ nna anyị. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Matiu, Mak, na Luk, Jizọs kpọrọ Chineke “Nna” ihe dị ka ugboro iri isii na ise, ọ kpọkwara ya “Nna” ihe karịrị otu narị ugboro n’Oziọma Jọn. Pọl kpọkwara Chineke “Nna” ihe karịrị ugboro iri anọ n’akwụkwọ ozi ndị o dere. Jehova bụ Nna anyị n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ.