Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụrụ na ndị malitere ịsụ ụzọ ọhụrụ agaghị eju otu klas, e nwere ike ịkpọ ụfọdụ ndị gara ụlọ akwụkwọ ahụ ihe karịrị afọ ise gara aga ka ha gaa nke ugboro abụọ.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Okenye Ọgbakọ
Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma n’ọgbakọ, meekwa ka ha ghọtakwuo ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme.
Oge Ọ Na-ewe: Ụbọchị ise.
Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya; ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.
Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ naanị ndị okenye.
Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị okenye mgbe ha ga-aga ya.
Ụfọdụ ndị gara klas nke iri itoolu na abụọ n’Amerịka kwuru, sị:
“Ụlọ akwụkwọ a abaarala m ezigbo uru. O nyerela m aka ileru onwe m anya ma mata otú m nwere ike isi na-elekọta atụrụ Jehova.”
“Adị m njikere ime ka isi ihe ndị dị na Baịbụl doo anya, nke ga-eme ka m na-agbakwu onye ọ bụla ume.”
“Agaghị m echefu ihe a kụziiri m n’ụlọ akwụkwọ a echefu ná ndụ m niile.”
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị na Nwunye Ha
Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti otú ha ga-esi na-eleta ọgbakọ nke ọma ma “na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.”—1 Tim. 5:17; 1 Pita 5:2, 3.
Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.
Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a na-anọ enwe ya.
Ndị Na-aga Ya: Ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti.
Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti na ndị nwunye ha mgbe ha ga-aga ya.
Joel, bụ́ onye gara klas nke mbụ n’afọ 1999, kwuru, sị: “E mere ka anyị ghọtakwuo otú anyị ga-esi na-akwanyere Jizọs bụ́ onyeisi nzukọ Jehova ùgwù. Anyị mụtara na anyị kwesịrị ịna-agba ụmụnna ndị anyị na-elekọta ume, na-emekwa ka ọgbakọ ọ bụla dị n’otu. Ụlọ akwụkwọ ahụ nyekwaara anyị aka ịghọta na n’agbanyeghị na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-adụ ụmụnna ọdụ ma na-agbazi ha mgbe ụfọdụ, ihe kacha mkpa ha na-arụ bụ inyere ụmụnna aka ịghọta na Jehova hụrụ ha n’anya.”
Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị
Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwaanyị otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ndị e nyekwuru ha ná nzukọ Jehova. Ha gachaa ụlọ akwụkwọ a, a na-eziga ọtụtụ n’ime ha n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ná mba ha. A na-ezigakwa ụfọdụ n’ime ha ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịga. E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge, e ziga ha ịmalite ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo nakwa n’ebe dịpụrụ adịpụ.
Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.
Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya; ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.
Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ ụmụnna nwoke ndị na-alụbeghị nwaanyị, ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na iri isii na abụọ na-aga ya. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ije ozi n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ka ukwuu. (Mak 10:29, 30) Ha ga-abụrịrị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi jerela ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala, bụrụkwa ọsụ ụzọ jerela ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala.
Otú E Si Edenye Aha: Ndị nwere mmasị ịga ya na-aga nzukọ a na-enwe ná mgbakọ sekit, bụ́ ebe a na-akọwara ha ihe ndị ha kwesịrị ịma.
Rick, bụ́ onye gara klas nke iri abụọ na atọ e nwere n’Amerịka, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m ji obi m niile ṅaa ntị n’ụlọ akwụkwọ ahụ, mmụọ nsọ Jehova gbanwere obi m. Mgbe ọ bụla Jehova nyere mmadụ ọrụ, ọ na-akwado ya n’ọrụ ahụ. Amụtara m na ọ bụrụ na mụ elekwasị anya n’ime uche Chineke, kama ime uche nke m, ọ ga-enyere m aka.”
Andreas, bụ́ onye na-eje ozi na Jamanị, kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ ahụ kụziiri m ile nzukọ Jehova e nwere taa anya ka ọrụ ebube. Ọzụzụ e nyere m kwadebere m maka ọrụ ndị m ga-emecha rụọ. Ọtụtụ ihe atụ e si na Baịbụl nye anyị mere ka m mụta otu eziokwu dị mkpa, nke bụ́: Ijere Jehova na ụmụnna m ozi ga-eme ka m nwee ezi obi ụtọ.”
Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye
Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya enye ndị lụrụ di na nwunye ọzụzụ pụrụ iche, ka Jehova na nzukọ ya nwee ike iji ha rụọ ọrụ nke ọma. A ga-eziga ọtụtụ ndị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a n’ebe e nwere mkpa ná mba ha. E nwere ike iziga ụfọdụ ije ozi ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha ewepụta onwe ha. E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge, e ziga ha ịmalite ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo nakwa n’ebe dịpụrụ adịpụ.
Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.
Ebe A Na-anọ Enwe Ya: A na-enwe ụlọ akwụkwọ a n’Amerịka, ma malite na Septemba 2012, a ga na-enwekwa ya n’ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ. A ga na-enwekarị ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.
Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ ndị di na nwunye, ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na ise na iri ise na-aga ya. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ije ozi n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ka ukwuu. Ha ga-enwe ụdị àgwà ahụ Aịzaya nwere, bụ́ onye sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8) Ihe ọzọ bụ na ha ga-abụrịrị ndị di na nwunye lụrụla ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala, jeekwa ozi oge niile afọ abụọ n’akwụsịghị akwụsị. Nke nwoke ga-abụrịrị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala n’akwụsịghị akwụsị.
Otú E Si Edenye Aha: Ndị nwere mmasị ịga ya na-aga nzukọ a na-enwe ná mgbakọ distrikti, bụ́ ebe a na-agwa ha ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ịma. Ọ bụrụ na a naghị enwe nzukọ ahụ ná mgbakọ distrikti ná mba unu, ya abụrụkwa na ị chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ ahụ, i nwere ike idegara alaka ụlọ ọrụ unu akwụkwọ ka ha gwa gị ihe ị ga-eme.
Eric na Corina, (n’okpuru) bụ́ ndị gara klas nke mbụ e nwere n’afọ 2011, kwuru, sị: “Izu asatọ anyị nọrọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ gbanwere ndụ anyị kpamkpam, ọ bụkwa ezigbo ihe ùgwù maka di na nwunye ndị chọrọ ijekwuru Jehova ozi! Anyị ekpebisiela ike na anyị agaghị ekwe ka ihe ndị ọzọ anyị na-eme mee ka anyị ghara iji oge anyị na-eme ihe bara uru.”
Ụlọ Akwụkwọ Gilied
Ihe Mere E Ji Enwe Ya: A na-azụ ndị gara ya ịbụ ndị ozi ala ọzọ n’ebe ndị mmadụ bijuru ebiju, ịbụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ ịrụ ọrụ na Betel. Ihe mere e ji enwe ụlọ akwụkwọ a bụ ka e nwee ike ịhazikwu ozi ọma anyị na-eje na ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị.
Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa ise.
Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka.
Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ di na nwunye ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche, ya bụ, ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị ụlọ akwụkwọ a, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ ndị Betel. Ha ga-abụ ndị nọrọla n’ozi ahụ ruo afọ atọ n’akwụsịghị akwụsị. Ha ga-abụ ndị na-asụ Bekee nke ọma, na-agụ ya ma na-ede ya.
Otú E Si Edenye Aha: Kọmitii Alaka nwere ike ịgwa ndị di na nwunye ka ha dejupụta akwụkwọ ịga ya.
Lade na Monique, bụ́ ndị si Amerịka, na-eje ozi ugbu a n’Afrịka. Lade kwuru, sị: “Ụlọ Akwụkwọ Gilied mere ka anyị jikere ịga ebe ọ bụla n’ụwa ma soro ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya rụkọọ ọrụ.”
Monique kwukwara, sị: “Ka m na-eme ihe ndị m mụtara n’Okwu Chineke, m na-enwe ezigbo ọṅụ n’ozi m. Aghọtara m na ọṅụ ahụ m na-enwe gosiri na Jehova hụrụ m n’anya.”
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha
Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị so na Kọmitii Alaka otú ha ga-esi na-elekọta Betel, na-eleba anya ná nsogbu ọgbakọ dị iche iche na-enwe n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma, nakwa otú ha ga-esi na-elekọta sekit na distrikti dị iche iche. A na-akụzikwara ha ihe gbasara ọrụ nsụgharị, ibi akwụkwọ, na izipụ akwụkwọ.
Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.
Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka.
Ndị Na-aga Ya: Nke nwoke ga-abụ onye so na Kọmitii Alaka ma ọ bụ Kọmitii Na-elekọta Mba ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a chọrọ ka o soro n’otu n’ime ha.
Otú E Si Edenye Aha: Òtù Na-achị Isi na-agwa ụmụnna nwoke na nwunye ha mgbe ha ga-aga ya.
Lowell na Cara, bụ́ ndị gara klas nke iri abụọ na ise, na-eje ozi ugbu a na Naịjirịa. Lowell kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ ahụ chetaara m na n’agbanyeghị ụdị ọrụ e nyere m ma ọ bụ otú o si yie ka enweghị m ohere, ihe kacha amasị Jehova bụ ime ihe ọ chọrọ. Ihe anyị mụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ mere ka o doo anya na otú anyị si emeso ndị ọzọ kwesịrị igosi ụdị ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ.”
Cara kwuru, sị: “Otu ihe e kwuru n’ụlọ akwụkwọ ahụ m ka na-atụgharị n’uche bụ: Ọ bụrụ na mụ agaghị akọwali ihe otú ọ ga-edo anya, m kwesịrị ịmụ ya nke ọma tupu mụ akụziwere ya ndị ọzọ.”