Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ́ bụrụkwanụ na o yiri ka nwa ahụ ò nwere nkwarụ ma ọ bụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ e tinyere n’akpa nwa nwaanyị ahụ towere? Ịkpachara anya gbuo nke ọ bụla bụ ite ime. Ụmụ nwaanyị ndị e ji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ mee ka ha tụrụ ime na-atụkarị ime ejima abụọ, atọ, ma ọ bụ karịa, nke nwere ike ime ka nwaanyị mụọ nwa na-akaghị aka ma ọ bụ mee ka ọbara na-agba ya. Ọ bụrụ na ụmụ nwaanyị bu n’afọ dị ọtụtụ, dọkịta nwere ike ịgba ya ume ka o kwe ka e gbuo otu ma ọ bụ karịa. Ọ ga-abụ ịkpachara anya tee ime, nke bụ́ igbu ọchụ.—Ọpụ. 21:22, 23; Ọma 139:16.