Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe okwu Hibru a sụgharịrị ‘ịtọ ntọala ụwa’ pụtara bụ ịgha mkpụrụ, ya bụ, ịmụ nwa. N’ihi ya, ihe a na-ekwu okwu ya bụ mmadụ mbụ a mụrụ n’ụwa. Ma, ebe ọ bụ Ken bụ nwa mbụ Adam na Iv mụrụ, olee ihe mere Jizọs ji hapụ Ken ma kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa”? Ihe ndị Ken kpebiri ime na ihe ndị o mechara mee gosiri na ọ ma ụma nupụrụ Jehova Chineke isi. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na a gaghị azọpụta Ken ma ọ bụ kpọlite ya n’ọnwụ otú ahụ a na-agaghị akpọlite nne na nna ya, bụ́ Adam na Iv.