Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
e Paragraf nke 13: Ihe Pọl onyeozi kwuru n’Ọrụ Ndịozi 20:29, 30 gosiri na e nwere ụzọ ndị abụọ ga-enye ọgbakọ Ndị Kraịst nsogbu. Ndị nke mbụ ga-abụ Ndị Kraịst adịgboroja (bụ́ ndị yiri ata). Ha “ga-abata n’etiti” ezigbo Ndị Kraịst. Ndị nke abụọ ga-abụ ‘ndị si n’etiti’ ezigbo Ndị Kraịst pụọ ma malite ịkụzi ozizi ụgha, “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ.”