Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ndị na-egwupụta ihe ndị dị n’ala ahụla ọtụtụ ụlọ arụsị ndị buru ibu n’ala ma pịọ ọnụ n’elu. Ọ bụ n’ala Shaịna ka ha hụrụ ha. Baịbụl kwuru na ndị ahụ wuru ụlọ elu na Bebel kpụrụ brik ma jiri ya rụọ ụlọ ahụ, ha ejighị nkume. O kwukwara na ha ji bitumen mere ụrọ. (Jenesis 11:3, 4) Akwụkwọ ahụ e ji eme nnyocha kwuru na nkume ‘dị ụkọ na Mesopotamia ma ọ bụkwanụ na o nwedịghị nke dị adị.’ Ma, bitumen juru eju n’ebe ahụ.