Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
d Ihe ndị na-eme n’ọtụtụ mba gosiri na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya na ụmụ ya gaa biri ná mba ọzọ, ọ na-akpata ezigbo nsogbu. O nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye kwaa iko, ma ọ bụdị dinaa nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya. O nwekwara ike ime ka mmadụ dinaa nwa ya, nwanne ya, ma ọ bụ onye ikwu ya. Ụmụaka nwekwara ike ha agaghị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Iwe nwere ike ịna-ewe ha, ha ana-echegbu onwe ha, obi ana-ajọ ha njọ, ma ọ bụkwanụ ha achọwa igbu onwe ha.