Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe Jizọs kwuru banyere ihe ịrịba ama a ga-eji mata oge ikpeazụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe atụ. Anyị kwesịrị icheta na o bu ụzọ kwuo banyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” bụ́ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna ya e tere mmanụ ga na-eduzi ndị Chineke. (Mat. 24:45-47) Ihe atụ ọzọ o nyere ha gbasara ndị niile nwere olileanya ịga eluigwe. (Mat. 25:1-30) N’ikpeazụ, Jizọs kwuru banyere ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ndị ga na-enyere ụmụnna ya aka. (Mat. 25:31-46) N’oge anyị a kwa, amụma ahụ Ezikiel buru bu ụzọ mezuo n’ebe ndị nwere olileanya ịga eluigwe nọ. N’agbanyeghị na alaeze ebo iri ahụ anaghị anọchikarị anya ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, otú ahụ ha na alaeze ebo abụọ ahụ si dị́ n’otu na-echetara anyị na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na ndị nwere olileanya ibi n’eluigwe dị n’otu ugbu a.