Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Otu nwoke na-ede akwụkwọ aha ya bụ James Parkes kwuru na ndị Rom nyere ndị Juu ikike ịna-eme omenala ha. O kwukwara na e nweghị oké ihe dị n’ikike a ha nyere ndị Juu n’ihi na ọ bụ ihe ndị Rom na-emere ndị dị́ iche iche ha na-achị. Ha na-ahapụ ha ka ha bụrụ obodo nọọrọ onwe ha, jirikwa aka ha na-ekpebi ihe ụfọdụ ha ga-eme.