Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’isiokwu a, “ndị gbara ọsọ ndụ” pụtara ndị hapụrụ ụlọ ha gbaga ebe ọzọ, ma ọ̀ bụ ná mba ọzọ ma ọ̀ bụ ná mba nke ha, n’ihi agha, mmegide ma ọ bụ ọdachi. Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ kwuru na e kee ndị bi n’ụwa taa ụzọ otu narị na iri na atọ, otu ụzọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ.