Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b NKỌWAKWU: Jehova nyere anyị ikike inyocha otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị nakwa àgwà anyị ka anyị nwee ike ịma ma ànyị na-eme nke ọma ma ọ bụ na anyị anaghị eme. Baịbụl kpọrọ ikike ahụ Jehova nyere anyị akọnuche. (Rom 2:15; 9:1) Akọnuche e ji Baịbụl zụọ na-eji iwu Jehova dị na Baịbụl amata ma ihe ndị anyị na-eche, ihe ndị anyị na-eme ma ọ bụ ihe ndị anyị na-ekwu, hà dị mma ma ọ bụ dị njọ.