Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a O nweghị onye n’ime anyị bu ịdị umeala n’obi pụta ụwa. Anyị ga-agba mbọ ka anyị mụta ya. Anyị nwere ike ịchọpụta na anyị na-adị umeala n’obi ma anyị na ndị na-eme udo na-emekọrịta ihe. Ma, o nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi ma anyị na ndị mpako na-emekọ ihe. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị anyị ga-agbalịsi ike merie ka anyị nwee ike ịdị umeala n’obi.