Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b NKỌWAKWU: Mgbaasị bụ nkwenkwe na ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ha na ndị mmụọ ọjọọ. Ihe so na ya bụ ikwe na mmadụ nwụọ, mmụọ ya na-apụ gaa biri ebe ọzọ, nakwa na ndị dị ndụ nwere ike iso onye ahụ na-ekwurịta okwu, karịchaa si n’aka ndị na-eme mgbaasị. Ihe ndị ọzọ so na ya bụ ịta amusu na ịgba afa. N’isiokwu a, anyị kwuo banyere majik, ihe anyị na-ekwu bụ ihe niile gbasara ime anwansi. Ihe ụfọdụ e ji mara ya bụ ịga na nke dibịa gwa ya ka o mesie mmadụ ike, ịkọ mmadụ ọgwụ ma ọ bụ imerụ ọgwụ a kọrọ mmadụ. Ọ bụghị ụdị ihe ụfọdụ ndị na-eji aghụghọ eme iji mee egwuregwu ma ọ bụ mee ndị mmadụ obi ụtọ.