Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe ụfọdụ, otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ nwere ike mee ka ụmụnna anyị ndị nọ n’ozi oge niile kwụsị ozi ha. E nwekwara ike gbanweere ha ọrụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná nsogbu ndị ha na-enwe na ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe gbanwerenụ. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ụmụnna ndị ọzọ nwere ike isi na-agba ha ume ma na-akwado ha, nakwa otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere anyị niile aka ma ihe gbanwee ná ndụ anyị.