Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
f Anyị ekwesịghịkwa iso n’òtù ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe ụgha, dị ka òtù ndị ntorobịa, ma ọ bụ iso n’ihe omume okpukpe ụgha haziiri ndị ntorobịa ma ọ bụkwanụ ịga n’ebe ha mepere maka imega ahụ́. Ọtụtụ n’ime òtù ndị ahụ e hiwere maka ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-agbalị ime ihe ụfọdụ na-eme ka ndị mmadụ chee na e nwechaghị ihe jikọrọ ha na okpukpe. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ndị okpukpe ụgha hiwere òtù ndị ahụ iji mezuo ihe ha bu n’obi.