Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Jizọs kwuru na ọ bụ ịhụnanya ka a ga-eji mata ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. Otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya na-eme ka anyị na-eme udo, ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu, na-elekwa ndị ọzọ ọbịa. Ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị nwere ike isi jiri obi anyị niile na-ahụ ụmụnna anyị n’anya.