Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Mach afọ 2021 ga-abụrụ Ndịàmà Jehova ụbọchị pụrụ iche. N’anyasị ụbọchị ahụ, a ga-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst. Ọtụtụ ndị ga-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst so ná ndị Jizọs kpọrọ “atụrụ ọzọ.” Olee eziokwu gbara ọkpụrụkpụ Ndịàmà Jehova mụtara gbasara atụrụ ọzọ ahụ n’afọ 1935? Olee ihe na-eme obi ụtọ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-atụ anya ya ma oké mkpagbu gachaa? Olee otú ndị so n’atụrụ ọzọ ga-esi eto Chineke na Jizọs Kraịst ma ha gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs?