Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ò nwere mgbe owu na-ama gị? Ya bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na Jehova maara ihe ndị gị na ha na-alụ nakwa na ọ dị njikere inyere gị aka. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ma owu mawa anyị. Anyị ga-amụtakwa ihe anyị ga-eme iji nyere ụmụnna anyị ndị owu na-ama aka.