Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b NKỌWA FOTO1: E nwere otu nwanna nwaanyị na-ekpe ekpere kemgbe ọ bụ nwata. N’oge ahụ, nne na nna ya kụziiri ya otú e si ekpe ekpere. Mgbe ọ nọ afọ iri na ụma, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ na-ekpekwa ekpere mgbe niile ka Jehova gọzie ozi ya. Mgbe ọrịa ọjọọ jidere di ya, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike ọ ga-eji die nsogbu a bịaara ya. Ugbu a ọ bụ nwaanyị isi mkpe, ọ ka na-ekpesikwa ekpere ike, obi sikwara ya ike na Jehova ga na-aza ekpere ya otú ahụ o si na-aza ya kemgbe ọ bụ nwata.