Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Jehova mere ka Zekaraya hụ ọtụtụ ọhụụ na-eme obi ụtọ. Ọhụụ ahụ mere ka Zekaraya na ndị Jehova maliteghachi ofufe dị ọcha n’agbanyeghị na ọ dịghịrị ha mfe. Ọhụụ ndị ahụ nwekwara ike inyere anyị aka iji obi anyị niile na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị dị mkpa anyị ga-amụta n’otu n’ime ọhụụ ndị Zekaraya hụrụ. N’ọhụụ ahụ, Zekaraya hụrụ ihe e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ.